Oru ugbo

oru ugbo
economic sector, field of work
obere ụdị nkeagriculture and forestry Dezie
Akụkụ nkeprimary sector of the economy, food system Dezie
na-esochigathering Dezie
oge obidoro8. millennium BCE Dezie
nwere mmetụtaigbukpọ osisi Dezie
mụrụ yaAgronomy Dezie
Ebe Data n'esonyeghi nọ Dezie
akụkọ ihe mere eme nke isiokwuhistory of agriculture Dezie
ihe eji ya emeAla a na-akọ ugbo, fresh water Dezie
WikiProject na-elekọta yaQ59078555 Dezie
Classification of Instructional Programs code01.0000, 01.00, 01 Dezie
NCI Thesaurus IDC16270 Dezie
Oge kachasị ịdị te aka15. millennium BCE Dezie
Local farm
Olu ugbo

Ọru ugbo bụ aka ọrụ e jiri mara ọtụtụ mba na obodo di n'elu ụwa. A na-arụkari ọrụ ugbo[1] n'ime ime obodo ebe enwere obosara ala. Nwoke, nwanyi, okorobịa na agbọghọbịa na-arụ ọrụ ugbo. A bia na ala Igbo, a ga-asị na obodo nile na-arụ oru ugbo. N'ezie, e ji ọrụ ugbo mara ndi Igbo. Ọtụtụ ihe ana-arụpụta na ọrụ ugbo bụ akpụ, ji, ede, ose, ndukwu, osikapa, ọka, ojoko na tomato. E nwekwara mkpụrụ osisi di iche iche a na-akọpụta na ọrụ ugbo dịka oloma, ube, ụdara, ụtụ, mangolo, une were diri gazie. Akwụkwọ nri ndi a na-akọpụta bụ ugu, arịgbe, keremkerem, ụgbọgurụ, nchụanwụ, keremkerem, elimieọnụ, anyụ, ọkazị na ndi ọzọ. Mgbe ufọdụ, ana-etinyekwa fatịlaịza n'ihe akọrọ ka owere mipụta erimeri nke ọma. Ana etinyekwa pesticides[2] ka ọchụpụ ụmụ ahụhụ na anụmanụ na atakacha ihe akụru na ugbo. Ọrụ ugbo chọrọ mmiri, aja di mma na ala di larịị. Akụkụ ọrụ ugbo ọzọkwa bụ izụ anụmanụ dika ikpa okụkụ, ewu, ehi, atụrụ na anụ ndi ọzọga. Otụtụ mba ụwa na ndi gọọmentị wepụtara anya na ebe ndi ọrụ ugbo nọ. Ha na -eme ka ọnụ ahịa ihe arụtara na ugbo daba ọfụma. Ha na-akụzikwara ndi mmadụ ọgbara ọhụ eji arụ ọrụ ugbo ma na-enyekwa ego mgbazinye ka ngwaahịa ndi ọrụ mịta nnukwu mmịmmị.[3]

  1. https://www.bbc.com/igbo/topics/c2dwqj3pv53t
  2. https://www.sertifikasyon.net/ig/hizmet/iyi-tarim-uygulamalari/
  3. Archive copy. Archived from the original on 2021-05-14. Retrieved on 2021-05-14.

From Wikipedia, the free encyclopedia · View on Wikipedia

Developed by Tubidy